Nzipụta Ndị Ọchịchị Na Ndị Ha Na-achị n’Ụfọdụ Abụ Igbo

Authors

  • Anagor, Chioma C. Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzirịkọrịtaozi, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka

Keywords:

Ọchịchị, ndị ọchịchị, ndọrọndọrọ ọchịchị na abụ.

Abstract

Ọchịchị n'ala anyị abụrụla ihe ọchị nye ndị a na-achị na mba ụwa ndị ọzọ n’ihi etu ndị ọchịchị si akpaso ndị ha na-achị agwa ọkachasị n’oge a. ndị ọchịchị ji ọchịchị emegide ụmụ mmadụ, ọtụtụ ihe mmekpo na-abawanye. Agụụ na-egbu ndị a na-achị, ihe na-akawanye njọ n’ike mana ahụghị onye a kọọrọ. Ndị nọ n’isi ọchịchị na-akpakọ akụnaụba ụmụ ha site n’ibughara ego e kwesịrị iji lekọta ndị a na-achị ma mezie obodo. Ihe ndị a ka ederede a chọrọ iji abụ anọ ndị a, Arịrịọ, n’Ịchụ Nta Vootu, Ọchịchị na Ndọrọndọrọ wee zipụta ọnọdụ ndị a na-achị nọ n’ime ya ka ụwa wee hụta ma nụrụ olu ha. Atụtụ marxizm nke Karl Marx 1818-1883 na Fredrich Engels 1820-1895 tụpụtara ka e ji tụchaa abụ ndị a ma gbaso usoro nkọwa mee ka ihe a na-ekwu doo anya. A chọpụtara na ndị ọchịchị abụghị ihe ha kwere na nkwa ha ga-emere ndị mmadụ n’oge ha na-achọ inweta ntuliaka ha ka ha na-emezị ngwangwa ha tutere ugo mmeri. Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mata na ego abụghị ihe niile n’ihi na ego anaghị anọte aka agwụ mana ha na-anọ ihe ruru afọ anọ n’oche ọchịchị tupu ha arịtuo ma ọ bụrụ na ha enwetaghị ntuliaka ndị mmadụ ịchị afọ anọ ọzọ. Ọ ga-abụ ihe dị mma ma ndị ọchịchị gee nti n’akwa na arịrịọ ndị ha na-achị iji mee mba a ka ọ dị ka mba ndị ọzọ n’ihi na ọ kwere omume ma ha kwụwa aka ha ọtọ.

Downloads

Published

2026-07-01

How to Cite

Anagor, Chioma C. (2026). Nzipụta Ndị Ọchịchị Na Ndị Ha Na-achị n’Ụfọdụ Abụ Igbo. Ákụ́óyìbó Nsugbe Journal of the School of Languages, 2(1), 350–359. Retrieved from https://ojs.universityedu.org/index.php/anjosol/article/view/226