Nzipụta Ndị Ọchịchị Na Ndị Ha Na-achị n’Ụfọdụ Abụ Igbo
Keywords:
Ọchịchị, ndị ọchịchị, ndọrọndọrọ ọchịchị na abụ.Abstract
Ọchịchị n'ala anyị abụrụla ihe ọchị nye ndị a na-achị na mba ụwa ndị ọzọ n’ihi etu ndị ọchịchị si akpaso ndị ha na-achị agwa ọkachasị n’oge a. ndị ọchịchị ji ọchịchị emegide ụmụ mmadụ, ọtụtụ ihe mmekpo na-abawanye. Agụụ na-egbu ndị a na-achị, ihe na-akawanye njọ n’ike mana ahụghị onye a kọọrọ. Ndị nọ n’isi ọchịchị na-akpakọ akụnaụba ụmụ ha site n’ibughara ego e kwesịrị iji lekọta ndị a na-achị ma mezie obodo. Ihe ndị a ka ederede a chọrọ iji abụ anọ ndị a, Arịrịọ, n’Ịchụ Nta Vootu, Ọchịchị na Ndọrọndọrọ wee zipụta ọnọdụ ndị a na-achị nọ n’ime ya ka ụwa wee hụta ma nụrụ olu ha. Atụtụ marxizm nke Karl Marx 1818-1883 na Fredrich Engels 1820-1895 tụpụtara ka e ji tụchaa abụ ndị a ma gbaso usoro nkọwa mee ka ihe a na-ekwu doo anya. A chọpụtara na ndị ọchịchị abụghị ihe ha kwere na nkwa ha ga-emere ndị mmadụ n’oge ha na-achọ inweta ntuliaka ha ka ha na-emezị ngwangwa ha tutere ugo mmeri. Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mata na ego abụghị ihe niile n’ihi na ego anaghị anọte aka agwụ mana ha na-anọ ihe ruru afọ anọ n’oche ọchịchị tupu ha arịtuo ma ọ bụrụ na ha enwetaghị ntuliaka ndị mmadụ ịchị afọ anọ ọzọ. Ọ ga-abụ ihe dị mma ma ndị ọchịchị gee nti n’akwa na arịrịọ ndị ha na-achị iji mee mba a ka ọ dị ka mba ndị ọzọ n’ihi na ọ kwere omume ma ha kwụwa aka ha ọtọ.
Downloads
Published
How to Cite
Issue
Section
License
Copyright (c) 2026 Author(s)

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License.
Authors who publish with this journal agree to the following terms: (1) Authors retain copyright and grant the journal right of first publication with the work simultaneously licensed under a Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International. that allows others to share the work with an acknowledgement of the work's authorship and initial publication in this journal; (2) Authors can enter into separate, additional contractual arrangements for the non-exclusive distribution of the journal's published version of the work (e.g., post it to an institutional repository or publish it in a book), with an acknowledgement of its initial publication in this journal; (3) Authors are permitted and encouraged to post their work online (e.g., in institutional repositories or on their website) before and during the submission process, as it can lead to productive exchanges, as well as earlier and greater citation of published work. Read the detailed Copyright Notice
