Akụkọ ifo dịka mkpanaka e ji akụzi ezigbo omume: mgbakwasị ụkwụ n’akụkọ ifo mbe na ezi na nwa agwọ na nwa awọ

Authors

  • Okechukwu S. Obiechina Department of Linguistic/Igbo Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University, Igbariam, Anambra State Nigeria
  • Abuchi Innocent Okoye Department of Linguistic/Igbo Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University, Igbariam, Anambra State Nigeria

Keywords:

Akụkọ ifo, mkpanaka, nkụzi,, ezigbo omume,, akụkọ ifo,, mbe

Abstract

Akụkọ ifo jupụtara n’amamihe pụrụ iche nke na-abawanye akọnuche ma bụrụkwa mkpanaka e ji akụzi eziomume n’ụwa.Ọ bara uru, ọkachasi n'ụlọakwụkwọ ntakara na prima makana ụmụaka na-esite na ya amụta ọtụtụ ihe nke ga-enyere ha aka ịkpa agwa ziri ezi. Ma taa,a na-eleghara ya anya,ọ bụ ya kpalitere nchọcha a. Ebumnuche nchọcha a bụ ịchọpụta ka akụkọ ifo ndị a họpụtara siri bụrụ mkpanaka e ji akụzi eziomume n’ụwa taa. Ndị nchọcha gbasoro usoro nchọcha kenkọwa wee mee nchọcha a.Ihe e ji mee nchọcha a bụ akụkọ ifo abụọ. Akụkọ ifo mbe na ezi na nwa agwọ na nwa awọ. N’akụkọ ifo mbe na ezi a chọpụtara, ajọ omume ịgbaziri ego ma jụ ịkwụghachi ya jupụtara n’ụwa taa. N’akụkọ ifo nwa agwọ na nwa awọ a chọpụtara na ụwa a dịbu mma na mbido mana ọ bụ ụmụ ụwa jiri obi ọjọọ were mebie ya. N’ikpeazụ, nwanchọcha tụnyere alo ka e lebaa anya n’ọmụmụ akụkọ ifo Igbo n’ihi na ọtụtụ ihe mmụta na ezi ndụmọdụ nke na-arụtụgasị aka n’ihe na-eme n’ụwa taa jupụtara na ya..

Downloads

Published

2025-12-08

How to Cite

Okechukwu S. Obiechina, & Abuchi Innocent Okoye. (2025). Akụkọ ifo dịka mkpanaka e ji akụzi ezigbo omume: mgbakwasị ụkwụ n’akụkọ ifo mbe na ezi na nwa agwọ na nwa awọ. Ákụ́òyíbó Nsugbe Journal of the School of Languages, 1(1), 38–45. Retrieved from https://ojs.universityedu.org/index.php/anjosol/article/view/45